Wednesday, November 30, 2011

Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu (1933-2011)


Kaemesia, Enyi Biafra!
Dike eji eje mba
Nwa Sir Louis-na-Nnewi
Odumegwu Ojukwu

Jee ọfụma, Odogwu Biafra!
Nwa amụlụ n'ego
Jelụ Sandhurst tute ugo
N’afa ndị Naijiria

Nọdụ mma, Ọchịagha Biafra!
Jelu Aburi gwa Gowon
Na Igbo abụro osisi
Nụlụ na-aga egbu ya kwụlụ

Jee n'udo Ikemba Nnewi
Jee gwakwa ndị ichie
na alụ Naijiria talụ anyị n’agha
ekwerọ anyị afụ ụzọ

Ma ka m jụọkwanụ:
Onye ga-agụgụ anyị?
Ka anyị a ga-atọzị
N’akwa ndeli?

No comments: